37 “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe ma ọlị;+ kwụsịkwanụ ịma ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe ma ọlị. Na-atọhapụnụ ndị mmadụ, a ga-atọhapụkwa unu.+
2Ya mere, i nweghị ihe ngọpụ, gị mmadụ,+ onye ọ sọrọ gị bụrụ, ma ọ bụrụ na ị na-ekpe mmadụ ikpe;+ n’ihi na n’ihe ahụ ị na-ekpe onye ọzọ ikpe, ị na-ama onwe gị ikpe, ebe ọ bụ na gị onye na-ekpe mmadụ ikpe+ na-eme otu ihe ahụ.+
5 N’ihi ya, unu ekpela ihe ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, ruo mgbe Onyenwe anyị ga-abịa,+ bụ́ onye ga-eme ka ihe nzuzo dị iche iche nke ọchịchịrị pụta ìhè,+ meekwa ka ihe e bu n’obi pụta ìhè,+ mgbe ahụkwa ka onye ọ bụla ga-enweta otuto ya site n’aka Chineke.+