13 Mgbe ahụ, eze ahụ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị, ‘Keenụ ya agbụ ụkwụ na aka ma tụpụ ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.’+
28 Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé,+ mgbe unu ga-ahụ Ebreham na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile n’alaeze Chineke,+ ma a tụpụ unu onwe unu n’èzí.