23 Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe+ okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, anyị ga-abịakwutekwa ya wee mee ka ebe obibi anyị dị n’ebe ọ nọ.+
17 Jizọs sịrị ya: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́. N’ihi na arịgobeghị m gakwuru Nna m. Ma gakwuru ụmụnna m,+ sị ha, ‘Ana m arịgokwuru Nna m+ na Nna unu nakwa Chineke m+ na Chineke unu.’”+
29 n’ihi na ndị mbụ o lebaara anya+ ka o kpebikwara tupu oge eruo+ na a ga-eme ka ha dịrị+ otú Ọkpara ya dị,+ ka o wee bụrụ onye e bu ụzọ mụọ+ n’etiti ọtụtụ ụmụnna.+