26 Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha.+ Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+
6 O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ n’ala. O wee were ogbe achịcha asaa ahụ, kelee Chineke,+ nyawaa ha, malite iwere ha na-enye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaa, ha wee were ha kesaara ìgwè mmadụ ahụ.+