7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+
13 Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam+ ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa+ megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam,+ na-emekwanụ otú ahụ.