43 Josef onye Arimatia bịara. Ọ bụ onye òtù Nzukọ.* Ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù, onye nọkwa na-echere alaeze Chineke.+ O ji obi ike gaa n’ihu Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu+ Jizọs.
38 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Josef onye Arimatia rịọrọ Paịlet ka ya buru ozu Jizọs. Ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ na nzuzo, n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu;+ Paịlet wee nye ya ikike.+ O wee bịa buru ozu ya.+