Mak
15 Ozugbo o ruru n’isi ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ, ya bụ, Sanhedrin dum, gbara izu.+ Ha wee kee Jizọs agbụ ma kpụrụ ya pụọ wee nyefee ya n’aka Paịlet.+ 2 Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ eze+ ndị Juu?” Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”+ 3 Ma ndị isi nchụàjà gara n’ihu ibo ya ọtụtụ ebubo.+ 4 Paịlet wee malite ọzọ ịjụ ya, sị: “Í nweghị ihe ị ga-aza?+ Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”+ 5 Ma ọ dịghị ihe ọzọ Jizọs zara, o wee ju Paịlet anya.+
6 Mgbe ọ bụla a na-eme ememme a, ọ na-ahapụrụ ha otu onye mkpọrọ nke ha rịọrọ ka ọ tọhapụrụ ha.+ 7 N’oge ahụ, e nwere otu onye a na-akpọ Barabas, onye a tụrụ ya na ndị na-emegide ọchịchị mkpọrọ. Ndị a gburu ọchụ mgbe ha na-emegide ọchịchị.+ 8 Ya mere, ìgwè mmadụ ahụ bịara wee malite ịrịọ ya ka o meere ha ihe ọ na-emere ha. 9 Paịlet sịrị ha: “Ùnu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”+ 10 N’ihi na ọ maara na ọ bụ anyaụfụ+ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee ya n’aka ya.+ 11 Ma ndị isi nchụàjà ahụ kpasuru ìgwè mmadụ ahụ ime aghara ka o wee hapụrụ ha Barabas, kama ịhapụ Jizọs.+ 12 Paịlet gwakwara ha, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme onye ahụ unu na-akpọ eze+ ndị Juu?”+ 13 Ha tiri mkpu ọzọ, sị: “Kpọgide ya n’osisi!”+ 14 Ma Paịlet gara n’ihu ịsị ha: “N’ihi gịnị, olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tikwuru mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi!”+ 15 Paịlet wee hapụrụ ha Barabas n’ihi na ọ chọrọ ime ihe ìgwè mmadụ ahụ kwuru.+ Mgbe ọ pịasịrị Jizọs ụtarị, o nyefere ya n’aka ha ka a kpọgide ya n’osisi.+
16 Ndị agha wee kpụrụ ya banye na mbara èzí, ya bụ, n’obí gọvanọ; ha kpọkọtakwara ndị agha dum,+ 17 ha wee yiwe ya ákwà na-acha odo odo, jirikwa ogwu kpaa okpueze, were ya kpuwe ya.+ 18 Ha malitekwara ikele ya, sị: “Ndeewo,+ gị Eze ndị Juu!” 19 Ha na-etikwa ya okporo amị n’isi ma na-agbụ ya ọnụ mmiri, ha na-egbukwa ikpere n’ala kpọọrọ ya isiala.+ 20 N’ikpeazụ, mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya ákwà ahụ na-acha odo odo ma yiwe ya uwe elu ya. Ha wee kpụrụ ya pụọ ka ha kpọgide ya n’osisi.+ 21 Ha manyekwara otu onye na-agafe agafe, bụ́ Saịmọn onye Saịrini, onye si n’ime obodo na-abịa, bụ́ nna Alegzanda na Rufọs, ka o buru osisi ịta ahụhụ Jizọs.+
22 Ha wee kpọta ya n’ebe bụ́ Gọlgọta, nke pụtara, ma a sụgharịa ya, Ebe Okpokoro Isi.+ 23 N’ebe a, ha nwara inye ya mmanya a gwakọtara ya na mea+ na-egbu egbu, ma ọ ṅụghị ya.+ 24 Ha wee kpọgide ya n’osisi. Ha kekwara uwe elu+ ya site n’ife nza ka ha wee mara onye ga-ewere nke ọ ga-ewere.+ 25 Ma ọ bụ oge awa nke atọ,*+ ha wee kpọgide ya n’osisi. 26 E dekwara ebubo e boro ya+ n’elu osisi ahụ, ya bụ, “Eze ndị Juu.”+ 27 Ha kpọgidekọkwara ya na mmadụ abụọ na-apụnara mmadụ ihe n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 28* —— 29 Ndị na-agafe agafe nọ na-ekwujọ ya,+ na-efufe isi, sị: “Tụfịa! Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ,+ 30 zọpụta onwe gị site n’isi n’osisi ịta ahụhụ ahụ rịdata.”+ 31 Otú ahụkwa ka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ji ya na-eme ihe ọchị n’etiti onwe ha, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!+ 32 Ka Kraịst bụ́ Eze Izrel si n’osisi ịta ahụhụ rịdata ugbu a, ka anyị wee hụ ma kwere.”+ Ọbụna ndị ahụ a kpọgidekọrọ ya na ha n’osisi nọ na-akọcha ya.+
33 Mgbe o ruru oge awa nke isii,* ọchịchịrị gbachiri ala ahụ dum ruo n’oge awa nke itoolu.*+ 34 N’oge awa nke itoolu kwa, Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” nke pụtara, ma a sụgharịa ya: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji gbahapụ m?”+ 35 Mgbe ụfọdụ n’ime ndị guzo nso nụrụ ya, ha malitere ịsị: “Lee! Ọ na-akpọ Ịlaịja.”+ 36 Ma otu onye gbaara ọsọ wee mikpuo ogbo n’ime mmanya gbara ụka, dokwasị ya n’okporo amị, wee malite inye ya ka ọ ṅụọ,+ sị: “Hapụnụ ya! Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa kpọdata ya.”+ 37 Ma Jizọs tiri oké mkpu wee kubie ume.+ 38 Ákwà mgbochi+ nke ebe nsọ wee dọwaa ụzọ abụọ malite n’elu ruo n’ala.+ 39 Ma mgbe onyeisi ndị agha nke guzo nso ma na-ele ya anya hụrụ ihe ndị a mere mgbe o kubiri ume, ọ sịrị: “N’ezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”+
40 E nwekwara ndị inyom nọ n’ebe dịtụ anya na-ele anya,+ Meri Magdalin so n’ime ha, tinyere Meri bụ́ nne Jems nke Nta na Josis, nakwa Salomi,+ 41 bụ́ ndị na-eso ya+ ma na-ejere ya ozi mgbe ọ nọ na Galili, na ọtụtụ ndị inyom ndị ọzọ ya na ha so gbagote Jeruselem.+
42 Ma mgbe o ruru mgbede, ebe ọ bụ ụbọchị Nkwadebe, ya bụ, chi ga-abọta ụbọchị izu ike, 43 Josef onye Arimatia bịara. Ọ bụ onye òtù Nzukọ.* Ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù, onye nọkwa na-echere alaeze Chineke.+ O ji obi ike gaa n’ihu Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu+ Jizọs. 44 Ma Paịlet chọrọ ịma ma ọ̀ nwụọla, mgbe ọ kpọrọ onyeisi ndị agha ahụ, ọ jụrụ ya ma ọ̀ nwụwo. 45 Ya mere, mgbe ọ chọpụtara n’aka onyeisi ndị agha ahụ, o nyere Josef ikike iburu ozu ahụ.+ 46 Ya mere, ọ zụrụ ákwà linin ọma ma budata ya, were ákwà linin ọma ahụ fụọ ya ma lie ya+ n’ili+ e gwuru n’oké nkume; o wee kwara otu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili ncheta ahụ.+ 47 Ma Meri Magdalin na Meri nne Josis nọ na-ele anya n’ebe ahụ e liri ya.+