15 Jizọs zara ya, sị: “Ka ọ dị otú a n’oge a, n’ihi na otú a ka o kwesịrị ekwesị ka anyị mezuo ihe niile bụ́ ezi omume.”+ Mgbe ahụ, ọ kwụsịrị igbochi ya.
32 N’ihi na Jọn bịakwutere unu, na-egosi unu ụzọ ezi omume,+ ma unu ekwereghị ya.+ Otú ọ dị, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwaanyị akwụna kweere ya,+ ma unu onwe unu, ọ bụ ezie na unu hụrụ nke a, unu akwaghị ụta n’ikpeazụ ka unu wee kwere ya.