23 Ma nke ahụ a ghara n’ala dị mma bụ onye na-anụ okwu ahụ ma na-aghọta ihe ọ pụtara, bụ́ onye na-amị mkpụrụ ma na-emepụta ihe, nke a okpukpu otu narị, nke ahụ iri isii, nke ọzọ iri atọ.”+
20 N’ikpeazụ, ndị a ghara n’ala dị mma bụ ndị na-ege ntị n’okwu ahụ, na-anabatakwa ya nke ọma ma na-amị mkpụrụ okpukpu iri atọ nakwa iri isii nakwa otu narị.”+
10 N’ihi na i debere okwu banyere ntachi obi m,+ m ga-echebekwa gị+ n’oge awa nke ule, bụ́ nke ga-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi, iji lee ndị bi n’elu ụwa ule.+