38 Ma ọ bụrụ na m na-arụ ha, ọ bụrụgodị na unu ekwereghị na m, kwerenụ ọrụ ndị ahụ,+ ka unu wee mara ma nọgide na-amara na mụ na Nna m dị n’otu, nakwa na Nna m na mụ onwe m dịkwa n’otu.”+
28 Unu nụrụ na m sịrị unu, M na-ala, m na-alọghachikwutekwa unu. Ọ bụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna m, n’ihi na Nna m ka m ukwuu.+