35 Mmụọ ozi ahụ zara ya, sị: “Mmụọ nsọ+ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ,+ Ọkpara Chineke.+
18 N’ihi nke a, ndị Juu malitere ịchọsi ike ka ha gbuo ya,+ n’ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-ada iwu Ụbọchị Izu Ike kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya,+ na-eme ka ya na Chineke hara.+