11 Ha bụ nkịta agụụ na-agụsi mkpụrụ obi ha ike;+ afọ adịghị eju ha eju.+ Ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta.+ Ha niile echewo ihu n’ụzọ nke ha, onye ọ bụla iji nweta uru na-ezighị ezi nke ya site n’ókè nke ala ya, na-asị:+
3 Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu n’ụzọ ọ bụla, n’ihi na ọ gaghị abịa ma ọ bụrụ na e bughị ụzọ nwee ndapụ n’ezi ofufe,+ e kpugheekwa+ onye ahụ na-emebi iwu,+ nke bụ́ nwa mbibi.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.