48 Ọ bụrụ na onye mbịarambịa bi n’ụlọ gị dị ka ọbịa, o wee bụrụ na ọ ga-emere Jehova ememme ngabiga ahụ, ka e bie nwoke ọ bụla bụ́ nke ya úgwù.+ E bichaa ya úgwù, ọ pụrụ ịbịa nso ime ememme a; ọ ga-adịkwa ka nwa afọ. Ma ọ dịghị nwoke a na-ebighị úgwù ga-eri ya.
6 “Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị sonyeere Jehova iji jeere ya ozi+ na iji hụ aha Jehova n’anya,+ iji bụrụ ndị ohu ya, ndị niile na-edebe ụbọchị izu ike ka ha ghara imerụ ya, ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike,+