44 O wee sị ha: “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere n’iwu Mozis na n’Akwụkwọ Ndị Amụma+ na Abụ Ọma+ banyere m aghaghị imezu.”
11 Jizọs zara ya, sị: “Ị gaghị enwe ikike ime m ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na e sighị n’elu nye gị ya.+ Ọ bụ ya mere onye ahụ nyefere m n’aka gị ji nwee mmehie ka ukwuu.”