8 Ma ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala,+ kama onye ọ bụla n’ime ha nọ na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’ajọ obi ya si dị;+ m wee mee ka ihe niile e kwuru n’ọgbụgba ndụ a mezuo n’isi ha, bụ́ ihe m nyere ha n’iwu ka ha na-eme, ma ha emeghị ya.’”
12 Ha mere ka obi ha+ dị ka nkume emụri ka ha ghara irube isi n’iwu+ nakwa n’okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru site na mmụọ ya,+ site n’ọnụ ndị amụma oge mbụ;+ Jehova nke ụsụụ ndị agha wee wee oké iwe.”+