10 Ka ọ̀ bụ naanị n’ihi anyị ka o ji na-ekwu ya? N’ezie, ọ bụ n’ihi anyị ka e ji dee ya,+ n’ihi na onye na-akọ ubi kwesịrị ịkọ ubi ma nwee olileanya, onye na-azọchakwa mkpụrụ kwesịrị ime otú ahụ ma nwee olileanya na ya ga-eri ya.+
6 Ma Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara+ nke na-elekọta ụlọ Onye ahụ.+ Anyị bụ ụlọ Onye ahụ, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie nkwuwa okwu anyị ike, na ịnya isi anyị n’ihi olileanya ahụ, ruo ọgwụgwụ.+
10 Ndị amụma, bụ́ ndị buru amụma+ banyere obiọma na-erughịrị mmadụ nke ga-abịara unu,+ jụrụ ase nke ọma banyere nzọpụta a, jirikwa nlezianya mee nnyocha banyere ya.+