Ndị Hibru
3 N’ihi ya, ụmụnna m ndị dị nsọ, ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe,+ cheenụ echiche banyere onyeozi+ na nnukwu onye nchụàjà nke anyị na-ekwusa banyere ya,+ ya bụ, Jizọs. 2 O kwesịrị ntụkwasị obi+ n’ebe Onye mere ka ọ bụrụ onye dị otú ahụ nọ, dịkwa ka Mozis+ kwesịrị ntụkwasị obi n’ụlọ Onye ahụ+ dum. 3 N’ihi na a na-agụ onye ahụ n’onye ruru eru ịnata otuto+ karịa Mozis, ebe ọ bụ na onye+ wuru ụlọ nwere ùgwù karịa ụlọ o wuru.+ 4 N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.+ 5 Dị ka onye na-eje ozi,+ Mozis kwesịrị ntụkwasị obi n’ụlọ Onye ahụ dum. Ozi o jere bụ ihe akaebe nke ihe ndị a ga-ekwu okwu banyere ha mgbe e mesịrị.+ 6 Ma Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara+ nke na-elekọta ụlọ Onye ahụ.+ Anyị bụ ụlọ Onye ahụ, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie nkwuwa okwu anyị ike, na ịnya isi anyị n’ihi olileanya ahụ, ruo ọgwụgwụ.+
7 N’ihi nke a, dị ka mmụọ nsọ+ kwuru, sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+ 8 unu akpọchila obi unu dị ka nna nna unu hà kpọchiri mgbe ha kpasuru m oké iwe,+ dị ka ha mere n’ụbọchị ha lere m ule+ n’ala ịkpa,+ 9 bụ́ ebe nna nna unu hà nọ nwaa m ọnwụnwa, leekwa m ule, ma ha hụrụ ọrụ m+ ruo afọ iri anọ.+ 10 N’ihi nke a, m wesoro ọgbọ ahụ iwe wee sị, ‘Ha na-akpafu akpafu n’obi ha mgbe niile,+ ha onwe ha amaghịkwa ụzọ m.’+ 11 Ya mere, aṅụrụ m iyi n’iwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye+ n’izu ike m.’”+
12 Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịmalite inwe ajọ obi nke na-enweghị okwukwe site n’ịhapụ Chineke dị ndụ;+ 13 ma na-agbanụ ibe unu ume+ kwa ụbọchị, n’ogologo oge a nke a pụrụ ịkpọ “Taa,”+ ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịbụ onye ike dị aghụghọ+ nke mmehie mere ka obi ya kpọchie. 14 N’ihi na, n’ezie, anyị bụ ndị nketa nke Kraịst+ naanị ma ọ bụrụ na anyị ejidesie obi ike ahụ anyị nwere ná mmalite ike ruo ọgwụgwụ,+ 15 ka a nọ na-ekwu, sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+ unu akpọchila obi unu dị ka nna nna unu hà mere mgbe ha kpasuru m oké iwe.”+
16 N’ihi na olee ndị nụrụ ya ma kpasuo ya oké iwe?+ N’eziokwu, ọ̀ bụ na ndị niile si n’Ijipt pụta n’okpuru Mozis emeghị otú ahụ?+ 17 Oleekwa ndị Chineke kpọrọ asị ruo afọ iri anọ?+ Ọ́ bụghị ndị ahụ mehierenụ, ndị ozu ha dara n’ala ịkpa?+ 18 Ma olee ndị ọ ṅụụrụ iyi+ na ha ekwesịghị ịba n’izu ike ya ma ọ́ bụghị ndị ahụ nupụrụ isi?+ 19 Ya mere, anyị na-ahụ na ha enweghị ike ịbanye n’ihi enweghị okwukwe.+