Ilu 20:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 Asịla: “M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m!”+ Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ,+ ọ ga-azọpụtakwa gị.+ Matiu 5:39 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 39 Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri,+ tụgharịkwaara ya nke ọzọ. Ndị Rom 12:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.+ Na-emenụ ihe dị mma n’anya mmadụ niile. 1 Ndị Tesalonaịka 5:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Hụnụ na ọ dịghị onye ji ihe ọjọọ na-akwụ onye ọ bụla ọzọ ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+ 1 Pita 3:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ,+ unu ejila nkwujọ akwụ ụgwọ nkwujọ,+ kama nke ahụ, na-agọzinụ+ ndị mmadụ, n’ihi na a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, ka unu wee keta ngọzi.
39 Otú ọ dị, ana m asị unu: Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị; kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri,+ tụgharịkwaara ya nke ọzọ.
15 Hụnụ na ọ dịghị onye ji ihe ọjọọ na-akwụ onye ọ bụla ọzọ ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+
9 unu ejila ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ,+ unu ejila nkwujọ akwụ ụgwọ nkwujọ,+ kama nke ahụ, na-agọzinụ+ ndị mmadụ, n’ihi na a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, ka unu wee keta ngọzi.