26 Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha.+ Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+
19 O wee were otu ogbe achịcha,+ kelee Chineke, nyawaa ya, ma were ya nye ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m+ nke a gaje inye n’ihi unu.+ Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”+