4 N’ihi na site n’oké mkpagbu na ihe na-ewute m n’obi ka m ji ọtụtụ anya mmiri+ detara unu akwụkwọ, ọ bụghị ka o wee wute+ unu, kama ka unu wee mara ịhụnanya nke m nwere karịsịa n’ebe unu nọ.
2N’ihi na achọrọ m ka unu mata otú m si na-agbasi mgba ike,+ bụ́ nke m na-agba n’ihi ọdịmma unu nakwa n’ihi ọdịmma nke ndị bi na Leodisia+ na ndị niile na-ahụbeghị ihu m anya n’anụ ahụ́,