16 ka ha na-anwa igbochi+ anyị ịgwa ndị mba ọzọ okwu ka e wee zọpụta ha,+ nke mere na ha na-emeru mmehie ha n’isi+ mgbe niile. Ma ọnụma ya emesịwo bịakwasị ha.+
17 ma Onyenwe anyị guzoro m nso+ ma nye m ike,+ ka e wee site n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ n’ụzọ zuru ezu, ka mba niile wee nụkwa ya;+ a napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.+