12 Ya mere, dị ka ndị Chineke họọrọ,+ ndị dị nsọ a hụrụ n’anya, yirinụ obi ọmịiko,+ obiọma, ịdị umeala n’obi,+ ịdị nwayọọ,+ na ogologo ntachi obi,+ dị ka uwe.
13 Otú ọ dị, anyị aghaghị ịdị na-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu, ụmụnna anyị ndị Jehova hụrụ n’anya, n’ihi na Chineke họọrọ unu+ site ná mmalite ka e wee zọpụta unu, site n’iji mmụọ nsọ+ doo unu nsọ,+ sitekwa n’okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ.+