4 Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume,+ ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị nke si n’ọnụ ya;+ ọ ga-ejikwa mmụọ nke egbugbere ọnụ ya gbuo onye ajọ omume.+
15 Ogologo mma agha dị nkọ sikwa n’ọnụ ya pụta,+ ka o jiri ya gbuo mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.+ Ọ na-azọchakwa mkpụrụ dị n’ebe nzọchapụta mmanya+ nke iwe nke ọnụma Chineke,+ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.