5 Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya,+ ka unu nọ na-enwe afọ ojuju+ n’ihe ndị dị ugbu a.+ N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”+
2 Na-azụnụ+ ìgwè atụrụ Chineke+ nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha;+ ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya,+ kama n’ịnụ ọkụ n’obi;