22 ka anyị jiri ezi obi na-abịaru nso, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe, ebe e fesaworo mmiri dị ọcha n’obi anyị ka ọ ghara inwe ajọ akọ na uche,+ jirikwa ya sachaa ahụ́ anyị.+
13 Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe,+ ọ bụ ezie na ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ,+ ma ha hụrụ ha n’ebe dị anya+ ma nabata ha ma kwusaa n’ihu ọha na ha bụ ndị bịara abịa na ndị bi nwa oge n’ala ahụ.+