5 Ma a mara ya ube+ n’ihi mmebi iwu anyị;+ a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.+ A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo,+ a gwọrọ anyị+ n’ihi ọnyá ya.+
26 n’ihi na o weere nkọcha+ nke Kraịst dị ka akụ̀ dị ukwuu karịa akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa nke Ijipt; n’ihi na o legidere anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ya.+
10 M wee daa n’ala n’ụkwụ ya ka m fee ya ofufe.+ Ma ọ sịrị m: “Kpachara anya! Emela ya!+ Abụ m naanị ohu ibe gị na ohu ụmụnna gị ndị nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.+ Fee Chineke,+ n’ihi na ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.”+