10 M wee sekpuru ala n’ụkwụ ya ka m fee ya. Ma ọ sịrị m: “Kpachara anya! Emela ya!+ Abụ m naanị ohu otú gị na ụmụnna gị bụkwa, unu ndị e nyere ọrụ ịna-agba àmà banyere Jizọs.+ Na-efe naanị Chineke,+ n’ihi na amụma ndị a na-ebu bụ maka ịgba àmà banyere Jizọs.”+