5 Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi+ n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie,+ unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ,+ n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m.+
6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+
15 Ọ bụ naanị na Jehova nwere mmasị n’ebe nna nna gị hà nọ ka o wee hụ ha n’anya, ọ bụ ya mere o ji họrọ ụmụ ha ndị nọchiri ha,+ ya bụ, unu, n’etiti ndị niile, dị ka ọ dị taa.
17 “Ha ga-aghọkwa nke m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “n’ụbọchị m ga-eme ka ha bụrụ ihe onwunwe m pụrụ iche.+ M ga-enwekwara ha ọmịiko, dị nnọọ ka mmadụ na-enwere nwa ya nke na-ejere ya ozi ọmịiko.+