58 Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike,+ bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị,+ ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu+ n’ime Onyenwe anyị.
11 N’ikpeazụ, ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nọgidenụ bụrụ ndị a na-agbazi, ndị a na-akasi obi,+ ndị nwere otu uche,+ na-ebinụ n’udo;+ Chineke nke ịhụnanya na nke udo+ ga-anọnyekwara unu.
13 ka o wee mee ka obi sie unu ike, meekwa ka obi unu bụrụ nke a na-apụghị ịta ụta+ n’ịdị nsọ n’ihu Chineke bụ́ Nna anyị n’oge ọnụnọ+ nke Onyenwe anyị Jizọs, ya na ndị nsọ ya niile.+