23 N’ihi na a mụwo unu ọzọ+ site ná mkpụrụ na-enye ndụ,+ nke na-apụghị ire ure,+ ọ bụghị site na nke pụrụ ire ure,+ site n’okwu+ Chineke bụ́ onye dị ndụ ma na-adịru+ mgbe ebighị ebi.
7 Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya,+ n’ihi na ịhụnanya+ si n’aka Chineke, onye ọ bụla nke nwere ịhụnanya, a mụrụ ya site na Chineke,+ o nwekwara ihe ọmụma banyere Chineke.+