9 N’ihi na ọ bụrụ na ihe ndị a adịghị n’ime onye ọ bụla, onye ahụ kpuru ìsì, o mechiri anya ya ka ọ ghara ịhụ ìhè,+ o chefuwokwa+ na a sachapụrụ ya+ mmehie o mere ogologo oge gara aga.
20 Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị: “Ahụrụ m Chineke n’anya,” ma ọ kpọrọ nwanna ya asị, ọ bụ onye ụgha.+ N’ihi na onye na-ahụghị nwanna ya n’anya,+ bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.+