2 Pita
1 Saịmọn Pita, ohu+ na onyeozi+ Jizọs Kraịst, na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị nataworo okwukwe nke bụ́ ihe ùgwù anyị na unu nwere n’ụzọ há nhata,+ site n’ezi omume+ nke Chineke anyị na nke Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst:+
2 Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo dị ukwuu dịrị unu+ site n’ezi ihe ọmụma+ nke Chineke na nke Jizọs Onyenwe anyị, 3 ebe ọ bụ na ike ya nke si n’aka Chineke enyewo anyị ihe niile banyere ndụ+ na nsọpụrụ Chineke+ n’efu, site n’ezi ihe ọmụma banyere onye ahụ nke kpọrọ+ anyị site n’ebube+ na omume ọma. 4 O sitewo n’ihe ndị a nye anyị n’efu ihe ndị o kwere ná nkwa dị oké ọnụ ahịa ma dị nnọọ ukwuu,+ ka unu wee site n’ihe ndị a ghọọ ndị ga-eso nwee ọdịdị+ Chineke,+ ebe unu gbanahụworo omume rere ure nke dị n’ụwa,+ nke na-esite n’agụụ ihe ọjọọ.
5 Ee, n’ihi ya, gosinụ otú ọ dị unu n’obi site n’itinye oké mgbalị.+ Tụkwasịnụ omume ọma+ n’okwukwe unu, n’omume ọma unu, tụkwasịnụ ihe ọmụma,+ 6 n’ihe ọmụma unu, tụkwasịnụ njide onwe onye, ná njide onwe onye unu,+ tụkwasịnụ ntachi obi, ná ntachi obi unu, tụkwasịnụ nsọpụrụ Chineke,+ 7 ná nsọpụrụ Chineke unu, tụkwasịnụ ịhụnanya ụmụnna, n’ịhụnanya ụmụnna unu, tụkwasịnụ ịhụnanya.+ 8 N’ihi na ọ bụrụ na ihe ndị a adịrị n’ime unu ma jubiga ókè, ha ga-eme ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ+ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.
9 N’ihi na ọ bụrụ na ihe ndị a adịghị n’ime onye ọ bụla, onye ahụ kpuru ìsì, o mechiri anya ya ka ọ ghara ịhụ ìhè,+ o chefuwokwa+ na a sachapụrụ ya+ mmehie o mere ogologo oge gara aga. 10 N’ihi ya, ụmụnna m, gbalịsienụ ike ọbụna karị ka unu mee ka òkù+ a kpọrọ unu na nhọrọ+ a họọrọ unu bụrụ ihe unu onwe unu ji n’aka; n’ihi na ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị ada mgbe ọ bụla.+ 11 N’eziokwu, a ga-esi otú a mee ka unu banye+ n’ụzọ dị ebube n’alaeze ebighị ebi+ nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.+
12 N’ihi ya, m ga-achọ ichetara+ unu ihe ndị a mgbe niile, ọ bụ ezie na unu maara ha ma bụrụ ndị nọsiri ike n’eziokwu+ ahụ nke dị n’ime unu.+ 13 Ma ebe m ka nọ n’ụlọikwuu a,+ echere m na o ziri ezi ịkpali unu site n’ichetara unu ihe ndị a,+ 14 ebe unu maara dị ka m maara na iyipụ ụlọikwuu m adịla nso,+ dịkwa nnọọ ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst mere ka m mata.+ 15 Ya mere, m ga-agbalịsi ike ka unu wee nwee ike ikwu banyere ihe ndị a niile n’onwe unu n’oge ọ bụla mgbe m pụsịrị.+
16 Ee e, ọ bụghị site n’iso akụkọ ụgha+ e ji akọ chepụta ka anyị mere ka unu mata banyere ike na ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ kama ọ bụ site n’ịbụ ndị ji anya ha hụ ịdị ebube ya.+ 17 N’ihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube+ n’aka Chineke bụ́ Nna, mgbe e si n’oké ebube ahụ gwa ya okwu, sị: “Onye a bụ ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.”+ 18 Ee, anyị nụrụ+ mgbe e si n’eluigwe kwuo okwu a mgbe anyị na ya nọ n’ugwu nsọ ahụ.+
19 Ya mere, e mewo ka okwu amụma ahụ+ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị;+ unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ntị na ya dị ka oriọna+ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị n’ime obi unu, ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ ewee nwuwe. 20 N’ihi na unu bu ụzọ mara nke a, na ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke si ná nkọwa mmadụ pụta.+ 21 N’ihi na ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla,+ kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke+ mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.+