7 Ma mgbe ha rụsịrị ụka nke ukwuu,+ Pita biliri, sị ha: “Ụmụnna m, unu maara nke ọma na, site na mmalite, Chineke si n’etiti unu họrọ m, ka ndị mba ọzọ wee site n’ọnụ m nụ okwu banyere ozi ọma ma kwere;+
28 E nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik,+ e nweghịkwa ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya,+ e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị;+ n’ihi na unu niile bụ otu onye n’ime Kraịst Jizọs.+