10 N’ihi na ruo ụbọchị ole na ole, ha na-adọ anyị aka ná ntị dị ka o si dị ha mma,+ ma ọ na-eme otú ahụ n’ihi ọdịmma anyị ka anyị wee keta òkè n’ịdị nsọ ya.+
2 Ndị m hụrụ n’anya, ugbu a, anyị bụ ụmụ Chineke,+ ma e mebeghị ka ihe anyị ga-abụ pụta ìhè.+ Anyị maara na mgbe ọ bụla e mere ka onye ahụ pụta ìhè,+ anyị ga-adị ka ya,+ n’ihi na anyị ga-ahụ ya otú ọ dị.+
6 Onye obi ụtọ+ na onye dị nsọ+ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ+ enweghị ikike+ n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.+