2 Ndị Kọrịnt 11:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 N’ihi na, dị ka o si dị, ọ bụrụ na mmadụ abịa na-ekwusa Jizọs nke dị iche na nke ahụ anyị kwusara,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na unu anata mmụọ dị iche na nke unu nataworo,+ ma ọ bụ, ozi ọma+ dị iche na nke unu nabatara, unu na-anabata onye ahụ ngwa ngwa.+ Ndị Galeshia 1:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ọ na-eju m anya na unu na-ahapụ Onye+ ahụ ọsọ ọsọ bụ́ onye ji obiọma Kraịst nke na-erughịrị mmadụ+ kpọọ unu, unu ewee na-aṅa ntị n’ụdị ozi ọma ọzọ.+ Ndị Efesọs 6:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Yirinụ ekike agha zuru ezu+ nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu;+ 1 Timoti 1:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Timoti nwa m, m na-enyefe gị iwu a+ n’aka dị ka amụma+ ndị e buru banyere gị si dị, ka i wee site n’ihe ndị a na-ebu agha ọma ahụ;+ 1 Timoti 6:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.+ Jidesie ndụ ebighị ebi ahụ aka ike, nke bụ́ ihe mere e ji kpọọ gị, i wee mee ezi nkwupụta ihu ọha+ n’ihu ọtụtụ ndị àmà.
4 N’ihi na, dị ka o si dị, ọ bụrụ na mmadụ abịa na-ekwusa Jizọs nke dị iche na nke ahụ anyị kwusara,+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na unu anata mmụọ dị iche na nke unu nataworo,+ ma ọ bụ, ozi ọma+ dị iche na nke unu nabatara, unu na-anabata onye ahụ ngwa ngwa.+
6 Ọ na-eju m anya na unu na-ahapụ Onye+ ahụ ọsọ ọsọ bụ́ onye ji obiọma Kraịst nke na-erughịrị mmadụ+ kpọọ unu, unu ewee na-aṅa ntị n’ụdị ozi ọma ọzọ.+
11 Yirinụ ekike agha zuru ezu+ nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu;+
18 Timoti nwa m, m na-enyefe gị iwu a+ n’aka dị ka amụma+ ndị e buru banyere gị si dị, ka i wee site n’ihe ndị a na-ebu agha ọma ahụ;+
12 Lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.+ Jidesie ndụ ebighị ebi ahụ aka ike, nke bụ́ ihe mere e ji kpọọ gị, i wee mee ezi nkwupụta ihu ọha+ n’ihu ọtụtụ ndị àmà.