Ndị Galeshia
1 Mụ onwe m bụ́ Pọl,+ abụ m onyeozi,+ ọ bụghị site n’aka ụmụ mmadụ ma ọ bụ site n’aka mmadụ, kama site n’aka Jizọs Kraịst+ na Chineke, bụ́ Nna,+ onye si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya.+ 2 Mụ na ụmụnna niile mụ na ha nọ+ na-edetara ọgbakọ ndị dị na Galeshia akwụkwọ:+
3 Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo+ nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu. 4 O nyere onwe ya maka mmehie anyị+ ka o wee napụta anyị n’ajọ usoro ihe dị ugbu a+ dị ka uche+ Chineke bụ́ Nna anyị si dị, 5 ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen.
6 Ọ na-eju m anya na unu na-ahapụ Onye+ ahụ ọsọ ọsọ bụ́ onye ji obiọma Kraịst nke na-erughịrị mmadụ+ kpọọ unu, unu ewee na-aṅa ntị n’ụdị ozi ọma ọzọ.+ 7 Ma ọ bụghị ozi ọma ọzọ; ọ bụ naanị na e nwere ndị ụfọdụ na-akpatara unu nsogbu+ ma na-achọ imerụ ozi ọma banyere Kraịst.+ 8 Otú ọ dị, ọ bụrụgodị na anyị ma ọ bụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe ezisaara unu ozi ọma karịrị ihe anyị zisaara unu n’ozi ọma, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.+ 9 Dị ka anyị kwuru, ana m ekwukwa ọzọ ugbu a, sị, Onye ọ bụla nke na-ezisara unu ozi ọma karịrị ihe unu nabatara,+ ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.
10 N’eziokwu, ọ̀ bụ mmadụ ka m na-anwa ime ka ha kweta ugbu a ka ọ̀ bụ Chineke? Ka m̀ na-achọ ime ihe na-amasị mmadụ?+ Ya bụrụ na m ka na-eme ihe na-amasị mmadụ,+ agaghị m abụ ohu Kraịst.+ 11 N’ihi na m na-eme ka unu mara, ụmụnna m, na ozi ọma ahụ m zisara abụghị nke mmadụ;+ 12 n’ihi na anataghị m ya n’aka mmadụ, ọ bụghịkwa mmadụ kụziiri m ya, kama ọ bụ Jizọs Kraịst kpugheere m ya.+
13 N’ezie, unu nụrụ banyere omume m n’oge gara aga n’okpukpe ndị Juu,+ na m nọgidere na-akpagbu+ ọgbakọ Chineke ma na-agbalị ibibi ya,+ ọbụna gabiga ókè, 14 m nọkwa na-enwe ọganihu dị ukwuu n’okpukpe ndị Juu karịa ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ m, bụ́ ndị agbụrụ m,+ ebe m na-anụrụ ọdịnala+ nna m hà ọkụ n’obi+ nke ukwuu karị. 15 Ma mgbe Chineke, onye kewapụtara m n’afọ nne m ma kpọọ+ m site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ,+ chere na ọ dị mma 16 ikpughe Ọkpara ya site n’aka m,+ ka m wee zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ya,+ agaghị m ozugbo ka mụ na anụ ahụ́ na ọbara gbaa izu.+ 17 Agbagoghịkwa m Jeruselem ka m gakwuru ndị bu m ụzọ bụrụ ndịozi,+ kama agawara m Arebia, alaghachikwara m ọzọ na Damaskọs.+
18 Afọ atọ mgbe nke ahụ gasịrị, agbagoro m Jeruselem+ ịga leta Sifas,+ mụ na ya nọkwara ruo ụbọchị iri na ise. 19 Ma ahụghị m onye ọ bụla ọzọ n’ime ndịozi, naanị Jems,+ nwanne+ Onyenwe anyị. 20 Ma banyere ihe ndị m na-edetara unu, lee! ana m agwa unu n’ihu Chineke na ọ bụghị ụgha ka m na-agha.+
21 E mesịa, abanyere m+ n’ógbè ndị dị gburugburu Siria na Silishia. 22 Ma ọgbakọ ndị dị na Judia bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu+ amaghị m ihu na ihu; 23 naanị ihe ha na-anụbu bụ: “Nwoke ahụ nke kpagburu anyị n’oge gara aga+ na-ezisa ozi ọma banyere okwukwe ahụ ugbu a bụ́ nke ọ gbalịrị ibibi n’oge gara aga.”+ 24 Ya mere, ha malitere inye Chineke otuto+ n’ihi m.