18 “Ị ga-eme efere ọla kọpa, werekwa ọla kọpa mee ihe ndọkwasị ya maka ịsa aka na ụkwụ,+ ị ga-adọba ya n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ma gbanye ya mmiri.+
23 O wee rụọ oké osimiri a wụrụ awụ+ nke dị kubit iri malite n’otu akụkụ ọnụ ya ruo n’akụkụ ọnụ ya nke ọzọ. Ọ dị okirikiri; ọ dịkwa kubit ise n’ịdị elu, ọ na-ewe eriri dị kubit iri atọ iji tụọ ya gburugburu.+