10 Mkpanaka eze agaghị apụ apụ na Juda,+ mkpara onye na-achị achị agaghịkwa apụ n’agbata ụkwụ ya, ruo mgbe Shaịlo* ga-abịa.+ Ọ* bụ ya ka mba dị iche iche ga-erubere isi.+
16 Ọ bụ Ebreham na nwa* ya ka e kwere nkwa ndị ahụ.+ Ihe e kwuru abụghị, “na ụmụ gị,”* ka à ga-asị na a na-ekwu banyere ọtụtụ ụmụ. Kama, a sịrị “na nwa gị,”* ya bụ, otu onye, bụ́ Kraịst.+