2 Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa Erọn nwanne gị nwoke na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka ọ ga na-abata n’ebe nsọ,+ n’ime ebe ahụ e gechiri ákwà mgbochi,+ n’ihu okwuchi Igbe ahụ, ka ọ ghara ịnwụ,+ n’ihi na m ga na-apụta n’ígwé ojii+ n’elu okwuchi+ Igbe ahụ.
11 Devid gwaziri Solomọn nwa ya otú ebe a ga-esi na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ ga-adị,+ otú ọnụ ụlọ dị iche iche ga-adị, ma ọnụ ụlọ ndị a ga na-akwasa ihe, ma ọnụ ụlọ ndị ga-adị n’elu, ma ọnụ ụlọ ndị ga-adị n’ime, ma ụlọ ebe a na-ekpuchi mmehie.+