8 Ma ọ zọpụtara ha n’ihi aha ya,+
Ka o wee mee ka a mara na ọ dị ike.+
9 Ọ baara Oké Osimiri Uhie mba, ya ataa.
O duuru ha si n’ala ala osimiri ahụ gafere ka à ga-asị na ọ bụ ala ịkpa.+
10 Ọ zọpụtara ha n’aka onye kpọrọ ha asị,+
Napụtakwa ha n’aka onye iro.+
11 Mmiri kpuchiri ndị iro ha.
E nweghị otu onye n’ime ha fọrọ.+