-
Ọnụ Ọgụgụ 4:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ha ga-edokwasị arịa niile ha ji eje ozi n’ebe ịchụàjà ahụ n’elu ya: ihe ndị e ji agụnye ọkụ, ndụdụ ya, shọvel ya, na efere ya, ya bụ, arịa niile e ji eje ozi n’ebe ịchụàjà ahụ.+ Ha ga-ewere ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee sachie ya ma tinye okporo osisi ndị e ji ebu ya.+
15 “Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eji ihe sachichaa ebe nsọ ahụ+ na arịa niile e ji eje ozi n’ebe nsọ mgbe ndị Izrel na-akwaga ebe ọzọ. Ụmụ Kohat ndị nwoke ga-abatazi ka ha buru ha.+ Ma ha agaghị emetụ ebe nsọ ahụ aka ka ha ghara ịnwụ.+ Ihe ndị a bụ ọrụ ụmụ Kohat ndị nwoke ga na-arụ n’ụlọikwuu nzute.
-