-
Levitikọs 8:14-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 O wee kpụta oké ehi e ji achụ àjà mmehie, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ahụ e ji achụ àjà mmehie.+ 15 Mosis gburu ya, jiri mkpịsị aka ya rụrụ ọbara+ ya tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ n’akụkụ ya niile ma kpuchiere ebe ịchụàjà ahụ mmehie. Ma, ọ wụsara ọbara fọrọ afọ n’ala ebe ịchụàjà ahụ ka o mee ka ọ dị nsọ, ka e wee na-ekpuchi mmehie n’elu ya. 16 Mosis wee were abụba niile dị n’elu eriri afọ oké ehi ahụ, abụba kpuchiri imeju ya, nakwa akụrụ ya abụọ na abụba ha, suo ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.+ 17 E wee kpọọ ihe niile fọrọ n’oké ehi ahụ ọkụ, ya bụ, akpụkpọ ya, anụ ya, na nsị ya. A kpọrọ ha ọkụ n’ebe dị anya n’ebe ha mara ụlọikwuu,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
-