-
Levitikọs 8:22-24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Ọ kpụtara ebule nke abụọ, bụ́ ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà.+ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke wee bikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 23 Mosis gburu ya, weretụ ọbara ya tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri Erọn nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya. 24 Mosis kpọtaziri ụmụ Erọn ndị nwoke, tesatụ ha ọbara ahụ n’ọnụ ọnụ ntị aka nri ha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ha nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ha. Ma, Mosis fesara ọbara nke fọrọ afọ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+
-