-
2 Ihe E Mere 26:18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ha gakwuuru Eze Ọzaya, sị ya: “Ọzaya, ọ bụghị gị kwesịrị ịmụnyere Jehova insens ọkụ.+ Ọ bụ naanị ndị nchụàjà kwesịrị ịna-amụnye insens ọkụ, n’ihi na ha bụ ụmụ ụmụ Erọn,+ ndị e doro nsọ. Si n’ụlọ nsọ a pụọ, n’ihi na i meela ihe ọjọọ. Jehova Chineke agaghị eme ka a kwanyere gị ùgwù n’ihi ihe a i mere.”
-
-
Ezikiel 8:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel guzo n’ihu ihe ndị ahụ, ha na Jeazanaya nwa Shefan.+ Onye nke ọ bụla jikwa ihe e ji etinye insens n’aka ya, insens nọkwa na-esi ísì ọma ka anwụrụ ọkụ ya na-akwụgo elu.+ 12 Onye ahụ gwara m, sị: “Nwa nke mmadụ, ị̀ hụla ihe ndị okenye Izrel na-eme n’ọchịchịrị, na onye ọ bụla n’ime ha nọ n’ime ime ụlọ ya ebe o dowere arụsị a pịrị apị? N’ihi na ha na-asị, ‘Jehova anaghị ahụ anyị. Jehova ahapụla ala a.’”+
-