34 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Weta ihe ndị a na-esi ísì ọma:+ mmanụ stakti, ọnịka na-esi ísì ọma, galbanọm na-esi ísì ọma, na frankinsens a na-agwaghị agwa. Otú otu hà ka ibe ya ga-aha. 35 Jiri ha mee insens.+ A ga-agwakọta ha nke ọma, tinye ya nnu.+ A gaghị etinye ya ihe ọzọ, ọ ga-adịkwa nsọ.