-
Jenesis 22:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Mmụọ ozi Jehova wee si n’eluigwe kpọọ Ebreham òkù nke ugboro abụọ, 16 sị: “Jehova sịrị, ‘Eji m onwe m na-aṅụ iyi+ na ebe ọ bụ na i mere ihe a, ị jụghịkwa inye m nwa gị nwoke, bụ́ otu mkpụrụ nwa ị mụrụ,+ 17 n’eziokwu, m ga-agọzi gị. N’eziokwu, m ga-eme ka ụmụ* gị dị ọtụtụ ka kpakpando ndị dị n’eluigwe nakwa ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ Nwa* gị ga-ewegharakwa obodo* ndị iro ya.+
-
-
Jenesis 35:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 Chineke sịrị ya: “Aha gị bụ Jekọb.+ A gaghịzi na-akpọ gị Jekọb, kama aha gị ga-abụzi Izrel.” Ọ maliteziri ịkpọ ya Izrel.+ 11 Chineke gwakwara ya, sị: “Abụ m Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba. Ị ga-abụ nna mba dị iche iche na ọtụtụ ìgwè mmadụ,+ ndị eze ga-esikwa n’agbụrụ gị.*+
-