2 Ndị Izrel wee malite isesa Mosis okwu,+ sị: “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Ma Mosis sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-esesa m okwu? Gịnị mere unu ji na-anwa Jehova ọnwụnwa?”+
7 “Chetanụ otú unu si kpasuo Jehova bụ́ Chineke unu iwe n’ala ịkpa,+ unu echefula. Malite n’ụbọchị unu si n’Ijipt pụta ruo mgbe unu rutere ebe a, unu nọ na-enupụrụ Jehova isi.+
27 N’ihi na ama m nke ọma na unu bụ ndị nnupụisi+ na ndị isi ike.+ Ọ bụrụ na unu na-enupụrụ Jehova isi otú a mgbe m ka nọ ndụ, unu ga-aka enupụ isi ma m nwụọ.