4 “Ọ bụ uwe ndị a ka ha ga-akpa: akpa a na-anya n’obi,+ efọd,+ uwe na-enweghị aka,+ uwe mwụda a kpara n’ụdị pụrụ iche,* ákwà isi,+ na ákwà a na-eke n’úkwù.+ Ha ga-akpara Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe nsọ ndị a, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.
7 O yiweziri Erọn uwe mwụda,+ kee ya ákwà a na-eke n’úkwù,+ yiwe ya uwe na-enweghị aka,+ yiwekwa ya efọd+ ma jiri eriri*+ efọd ahụ kegide efọd ahụ n’ahụ́ ya.