-
Ọnụ Ọgụgụ 15:3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 unu achọọ isi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụrụ Jehova,+ ma ọ̀ bụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ̀ bụ àjà mmadụ chọrọ iji mezuo nkwa pụrụ iche o kwere ma ọ̀ bụ onyinye si ya n’obi+ ọ chọrọ inye ma ọ bụ onyinye a na-enye n’oge ememme unu dị iche iche,+
-
-
Diuterọnọmi 12:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Kama, gaanụ fee Jehova bụ́ Chineke unu n’ebe ọ bụla ọ họọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya n’ebo unu niile nakwa n’ebe ọ họọrọ ka ọ bụrụ ebe ọ ga-ebi.+ 6 Ọ bụ n’ebe ahụ ka unu ga-eweta àjà unu a na-esu ọkụ,+ àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye unu kwere ná nkwa, onyinye si unu n’obi,+ anụmanụ ọ bụla ehi unu na ewu na atụrụ unu bu ụzọ mụọ,+ na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye.+
-