-
Luk 21:2-4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 O wee hụ otu nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, ka ọ tụnyere obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụta ihe dị nnọọ ntakịrị.*+ 3 Jizọs wee sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, nke dara ogbenye, tụnyere ego karịrị nke ha niile tụnyere.+ 4 N’ihi na ndị a niile si n’ọtụtụ ihe ha nwere na-atụnye onyinye ha n’igbe. Ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ.”*+
-